Hosea 8

Ụgwọ ọrụ mmehie

1“Tinye opi ike nʼọnụ gị!
Nʼihi na ugo nʼefefe nʼelu ụlọ Onyenwe anyị,
nʼihi na ha emebiela ọgbụgba ndụ m,
nupu isi megide iwu m.
2Ugbu a ndị Izrel na-etiku m mkpu akwa,
‘Chineke anyị, anyị bụ Izrel maara gị.’
3Ma Izrel ajụla ihe dị mma.
Ugbu a, ndị iro ga-achụ ya ọsọ.
4Ha meere onwe ha ndị eze, ma ha ajụtaghị m ase;
ha na-achọrọkwa ndị ọchịchị,
Ya bụ, ụmụ eze
ma ghara ịjụta ase nʼaka m.
Ọlaọcha na ọlaedo ha
ka ha ji na-akpụrụ onwe ha arụsị,
nke ha ji ebibi onwe ha.
5Ajụla m arụsị nwa ehi a ị kpụrụ, O Sameria.
Nʼihi na ọnụma m na-ere ọkụ megide ha.
Ruo olee mgbe ka ha ga-anọ bụrụ ndị na-enweghị ike ịdị ọcha?
6Ọ bụ nʼIzrel ka ha si.
Ọ bụ onye na-akpụ ụzụ kpụrụ ya;
ọ bụghị Chineke.
A ga-akụrisikwa
nwa ehi Sameria ahụ.

7“Ha akụọla ifufe,
ha ga-aghọtakwa oke ifufe.
Osisi ọka ha na-eguzo
na-enweghị okpo ọka ọbụla.
A sịkwarị na ọ mịrị mkpụrụ,
ndị mba ọzọ ga-atapịa ya.
8Elodala Izrel!
Lee, ha nọ ugbu a nʼetiti ndị mba ọzọ
dịka mkpọkọrọ ite.
9Nʼihi na ha ejeela Asịrịa
dịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya.
Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya.
10Ọ bụ ezie na ha ewerela onwe ha resi ọtụtụ mba dị iche iche,
aga m achịkọta ha.
Ha ga-atakwa ahụ
nʼihi ọnọdụ mmegbu nke eze na ndịisi ga-achị ha.

11“Nʼihi na Ifrem ewuola ọtụtụ ebe nchụaja maka ịchụ aja mmehie,
ebe nchụaja ndị a abụrụla ebe a na-eme mmehie.
12E depụtaara m ha ọtụtụ ihe banyere iwu m,
ma ha were ya dịka ihe e si na mba ọzọ webata.
13Ha na-achụ aja dịka onyinye nye m,
ha na-erikwa anụ ndị ahụ ha jiri chụọ aja,
ma na Onyenwe anyị enweghị mmasị nʼebe aja ha dị.
Ugbu a, ọ ga-echeta ajọ omume ha,
nye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie niile ha,
ha ga-alaghachi nʼIjipt.
14Izrel echezọọla Onye kere ha
ma wukwaa obi ndị eze dị iche iche.
Juda ewukwaala obodo dị iche iche e wusiri ike.
Nʼihi ya, aga m ezite ọkụ nʼobodo ha niile,
ọkụ ga-erepịa obodo ha niile e wusiri ike.”
Copyright information for IboBIU